Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Jun 2017

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Otú Okwukwe Gị Siruru n’Ike ná Nkwa Ndị Jehova Kwere?

Olee Otú Okwukwe Gị Siruru n’Ike ná Nkwa Ndị Jehova Kwere?

Jọshụa na Sọlọmọn mere ka o doo anya na ọ dịghị otu n’ime nkwa ndị Jehova kwere nke na-emezughị. (Jọsh. 23:14; 1 Eze 8:56) Àmà ndị akaebe abụọ a na-efe Chineke gbara ga-enyere anyị aka ime ka okwukwe anyị sikwuo ike.​—⁠2 Kọr. 13:1; Taị. 1:⁠2.

Olee otú Jehova si mezuo nkwa ndị o kwere n’oge Jọshụa? Gị na ndị ezinụlọ gị lee vidio bụ́ ‘Ọ Dịghị Otu Ihe Jehova Kwuru Nke Na-emezughị.’ Zaakwanụ ajụjụ ndị a: (1) Olee otú unu ga-esi ṅomie okwukwe Rehab? (Hib. 11:31; Jems 2:​24-26) (2) Olee otú ihe mere Ekan si gosi na mmadụ ịkpachara anya na-enupụrụ Jehova isi na-akpata ọdachi? (3) N’agbanyeghị na ndị Gibiọn bụ ndị dike, gịnị mere ha ji ghọgbuo Jọshụa iji mee ka ha na Izrel dịrị n’udo? (4) Olee otú ihe Jehova kwuru si mezuo mgbe ndị eze ise nke ndị Amọraịt bịara ibuso Izrel agha? (Jọsh. 10:​5-14) (5) Olee otú Jehova sirila nyere gị aka ná nsogbu ndị na-abịara gị n’ihi na i bu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ na ezi omume ya?​—⁠Mat. 6:⁠33.

Ịtụgharị uche n’ihe ndị Jehova merela, ihe ndị ọ na-eme ugbu a, na ihe ndị ọ ka ga-eme, ga-eme ka okwukwe anyị nwere na Jehova ga-emezu nkwa ya sikwuo ike.​—⁠Rom 8:​31, 32.

Ì nwere okwukwe ka Jọshụa?