Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Jun 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

TETA!

Ajụjụ: Baịbụl ọ̀ bụ akwụkwọ si n’aka Chineke? Ka ọ̀ bụ uche ụmụ mmadụ ka e dere na ya?

Amaokwu Baịbụl: 2 Tim. 3:⁠16

Otú a ga-esi enye ya: Teta! a, kwuru ụzọ ihe atọ gosiri na Baịbụl si n’aka Chineke n’eziokwu.

NA-AKỤZI EZIOKWU

Ajụjụ: Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndụ Chineke nyere anyị anya?

Amaokwu Baịbụl: Mkpu. 4:⁠11

Eziokwu: Ebe ọ bụ na ndụ bụ onyinye si n’aka Chineke, anyị kwesịrị iji ya kpọrọ ihe. Anyị kwesịrị ịkpachara anya maka ihe ọghọm. Anyị ekwesịghịkwa ịkpachara anya mee ihe ga-ewepụ ndụ mmadụ. Anyị ji ndụ Chineke nyere anyị kpọrọ ihe.

GỊNỊ GA-EME KA UNU NA-ENWE OBI ỤTỌ N’ỤLỌ UNU?

Ajụjụ: Legodị ajụjụ dị n’ihu traktị a, leekwa azịza ụfọdụ dị ná mgbada ya. Olee ihe i nwere ikwu gbasara ya?

Amaokwu Baịbụl: Luk 11:⁠28

Otú a ga-esi enye ya: Traktị a kọwara uru ime ihe a Chineke kwuru ga-abara ezinụlọ gị, na ihe mere i kwesịrị iji kwere ihe Baịbụl kwuru.

DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.