Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ JUN 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 52-59

“Tụkwasị Jehova Ibu Arọ Gị”

“Tụkwasị Jehova Ibu Arọ Gị”

E nwere ọtụtụ ọnwụnwa bịaara Devid mgbe ọ nọ ndụ. Mgbe ọ na-ede Abụ Ọma nke 55, ọ taala ọtụtụ ahụhụ. Ụfọdụ n’ime ihe ndị bịaara ya bụ . . .

  • Mkparị

  • Mmegide

  • Obi Amamikpe

  • Nsogbu Ezinụlọ

  • Ọrịa

  • Mgba Okpuru

Devid gbara mbọ chọta otú ọ ga-esi na-edi nsogbu ya, ọbụnadị mgbe o yiri ka à ga-asị na ọ gaghị edili ya. Ọ na-agwazi ndị niile ha na nsogbu na-alụ ka ha ‘tụkwasị Jehova ibu arọ ha.’

Olee otú anyị ga-esi atụkwasị Jehova ibu arọ anyị?

55:22

  1. O nwee ihe ọ bụla na-echegbu gị ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ nsogbu gị, kọọrọ ya Jehova n’ekpere

  2. Kwe ka Chineke jiri Okwu ya na ọgbakọ ya na-eduzi gị

  3. Mee ihe ọ bụla ị ma nwere ike ime ka ihe dịtụ mma, ma ọ bụrụhaala na ihe ahụ emegideghị ihe Baịbụl kwuru