Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Jun 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

“Chineke Bụ Onye Na-enyere M Aka”

“Chineke Bụ Onye Na-enyere M Aka”

N’Abụ Ọma nke 52-59, Devid kwuru otú obi dị ya n’oge dị iche iche nsogbu bịaara ya. Ọ tụkwasịrị Jehova obi n’agbanyeghị nsogbu ahụ niile. (Ọma 54:4; 55:22) O tokwara Chineke n’ihi okwu ya. (Ọma 56:10) Ànyị na-agbalị ka anyị nwee ụdị okwukwe na obi ike ahụ Devid nwere? Nsogbu bịara gị, ị̀ na-achọ ka Baịbụl gwa gị ihe ị ga-eme? (Ilu 2:6) Olee amaokwu Baịbụl ndị nyeerela gị aka mgbe  . . .

  • ike gwụrụ gị ma ọ bụ mgbe ị dara mbà?

  • ị na-arịa ọrịa?

  • mmadụ kpasuru gị iwe?

  • a na-emegide gị?