Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Julaị 2017

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-akpa Àgwà n’Ọnụ Ụzọ Mmadụ

Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-akpa Àgwà n’Ọnụ Ụzọ Mmadụ

A na-ele Ndị Kraịst anya otú ahụ e si ele ndị na-eme ‘ihe nkiri n’ebe a na-eme ihe nkiri.’ (1 Kọr. 4:9) N’ihi ya, anyị nọrọ n’ozi ọma, o kwesịghị iju anyị anya na ụfọdụ ndị na-esi na windo ha na-enyo anyị ma ọ bụ nọrọ n’ime ụlọ ha na-ege ihe anyị na-ekwu. Ụlọ ahụ nwere ike inwe onyokomita na maịkrofon zoro ezo onye nwe ụlọ ji na-ele ihe anyị na-eme ma ọ bụ na-eteepụ ya. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ụzọ ụfọdụ anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà n’ọnụ ụzọ mmadụ.—2 Kọr. 6:3.

OMUME ANYỊ (Fil. 1:27):

  • Anyị ga-egosi na anyị na-akwanyere onye nwe ụlọ ùgwù ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ịna-enyoba anya n’ụlọ ya. Erila ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe n’ọnụ ụzọ mmadụ. Azala ekwentị ma ọ bụ jiri ya na-ezigara mmadụ ozi n’ọnụ ụzọ mmadụ

OKWU ỌNỤ ANYỊ (Efe. 4:29):

  • Ị nọrọ n’ọnụ ụzọ mmadụ, ekwula ihe ọ bụla ị ma na ị gaghị achọ ka onye ahụ nụ. Ụfọdụ ndị nkwusa na-akwụsị mkparịta ụka ha ma ha ruwe n’ọnụ ụzọ mmadụ ka ha nwee ike ichebara ihe ha ga-ekwu echiche

Olee ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi na-akpa àgwà ọma n’ọnụ ụzọ mmadụ?