Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Julaị 2017

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ị̀ Na-agbaghara Onwe Gị?

Ị̀ Na-agbaghara Onwe Gị?

O nwere ike isiri anyị ike ịgbaghara onwe anyị mmehie Jehova gbaghaarala anyị. Ná mgbakọ “Guzosie Ike n’Ebe Jehova Nọ” e nwere n’afọ 2016, e kwuru okwu gbasara ya, gosikwa ya vidio. Jirinụ JW Library unu lee vidio ahụ ọzọ, zaakwanụ ajụjụ ndị a:

  • Afọ ole ka a chụrụ Sonja n’ọgbakọ?

  • Olee amaokwu Baịbụl ndị okenye gụụrụ Sonja, oleekwa otú o si nyere ya aka?

  • Olee otú ụmụnna si mesoo Sonja mgbe a nabataghachiri ya?

  • Olee ihe ndị nọ na-enye Sonja nsogbu n’obi, oleekwa otú papa ya si nyere ya aka?