Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ JULAỊ 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 60-68

Toonụ Jehova, Onye Na-anụ Ekpere

Toonụ Jehova, Onye Na-anụ Ekpere

Rịọ Jehova ka o nyere gị aka imezu nkwa i kwere ya

61:1, 8

  • Ọ bụrụ na anyị etinye nkwa anyị kwere Jehova n’ekpere, ọ ga-eme ka anyị gbasikwuo mbọ ike imezu ya

  • Nkwa kachanụ anyị kwere Chineke bụ inyefe ya onwe anyị

Hana

Ịkọrọ Jehova ihe ọ bụla na-enye gị nsogbu n’obi na-egosi na ị tụkwasịrị ya obi

62:8

  • Otu n’ime ihe ndị ga-eme ka ekpere anyị bụrụ nke dị mma bụ ịgwa Chineke otú obi dị anyị

  • Anyị ga-aka ama mgbe Jehova zara ekpere anyị ma anyị na-akpọ okwu aha mgbe anyị na-ekpe ekpere

Jizọs

Jehova na-anụ ekpere ndị niile na-erubere ya isi

65:1, 2

  • Jehova na-anụ ekpere ndị ji obi ha niile chọọ ịmara ya, ma chọọ ịna-erubere ya isi

  • Anyị nwere ike ikpe ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ

Kọnịliọs

Dee ihe ndị ị ga-etinye n’ekpere.