Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Julaị 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 74-78

Na-echeta Ihe Niile Jehova Mere

Na-echeta Ihe Niile Jehova Mere

Anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’ihe niile Jehova mere

74:16; 77:6, 11, 12

  • Ichebara ihe anyị na-agụ na Baịbụl echiche na-eme ka ihe ahụ ruo anyị n’obi, obi adịkwa anyị ụtọ maka ihe Chineke na-akụziri anyị

  • Ịna-eche gbasara Jehova ga-eme ka anyị na-echeta ihe ndị dị́ ịtụnanya o merela nakwa ihe ndị ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu

Ihe ndị so n’ihe Jehova mere bụ:

74:16, 17; 75:6, 7; 78:11-17

  • Ihe ndị o kere

  • Ịmatakwu banyere ihe ndị Jehova kere ga-eme ka anyị na-akwanyekwuru ya ùgwù

  • Ndị okenye ọgbakọ

  • Anyị kwesịrị ịna-erubere ndị Jehova ji na-eduzi ọgbakọ ya isi

  • Otú Jehova si anapụta ndị ya

  • Ịna-echeta otú Jehova si anaputa ndị ya ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na ọ ga na-elekọta anyị