Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Julaị 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ì Nwere Ike Iji Otu Afọ Nwalee Ya?

Ì Nwere Ike Iji Otu Afọ Nwalee Ya?

Nwalee gịnị? Ọ bụ ịsụ ụzọ oge niile. Ị ga-ahụ otú Jehova ga-esi agọzi gị ma ị nwalee ya.—Ilu 10:22.

ỊSỤ ỤZỌ GA-EME KA . . .

  • izi ozi ọma dokwuo gị anya ma na-atọ gị ụtọ

  • gị na Jehova dịkwuo ná mma. Ịgwa ndị ọzọ gbasara Jehova ga-eme ka ị na-echebakwuru àgwà ya dị iche iche echiche

  • i nwee afọ ojuju maka na i butere Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ gị, obi ga na-atọkwa gị ụtọ maka aka ị na-enyere ndị ọzọ.—Mat. 6:33; Ọrụ 20:35

  • i soro ná ndị ha na onye nlekọta sekit ga-enwe nnọkọ ma ọ bịa ileta ọgbakọ unu, ma a gaa mgbakọ sekit, gị esorokwa ná ndị ga-aga Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ

  • i nwekwuo ndị ị ga na-amụrụ Baịbụl

  • gị na ụmụnna ndị ọzọ na-apụta ozi ọma na-akpachikwu anya ma na-agbarịta onwe unu ume.—Rom 1:11, 12