Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ma mgbe ihe dịịrị anyị mma ma mgbe ihe siiri anyị ike. (Ọma 25:1, 2) N’ihe dị ka n’afọ 732 T.O.N.K., nsogbu kpụ ọkụ n’ọnụ dakwasịrị ndị Juu nọ́ na Juda nke mere ka a mata ma hà tụkwasịkwara Jehova obi. O nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’ihe mere ha n’oge ahụ. (Rom 15:4) Unu lechaa vidio a bụ́ “Jehova, . . . Ọ Bụ Gị ka M Tụkwasịrị Obi,” zaanụ ajụjụ ndị a na-esonu.

  1. Olee nsogbu bịaara Hezekaya?

  2. Olee otú Hezekaya si mee ihe ahụ e kwuru n’Ilu 22:3 mgbe ọ hụrụ na ndị Asiria na-achọ ịbịa nọchibido ha?

  3. Gịnị mere Hezekaya echeweghị echiche ịchịliri ndị Asiria aka elu ma ọ bụ ịrịọ ndị Ijipt ka ha nyere ha aka?

  4. Olee ihe Ndị Kraịst nwere ike ịmụta n’aka Hezekaya?

  5. Olee ihe ndị na-eme anyị taa ga-eme ka a mata ma ànyị tụkwasịkwara Jehova obi?

Dee oge ndị ọ ga-adị mkpa ka i gosi na ịtụkwasịkwuru Jehova obi.