Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Jenụwarị 2017

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | AỊZAYA 34-37

A Zọpụtara Ndị Chineke n’Ihi Okwukwe Hezekaya

A Zọpụtara Ndị Chineke n’Ihi Okwukwe Hezekaya

Senakerib, eze Asiria, zigara Rabshake ka ọ gaa Jeruselem gwa ndị Juu ka ha chịliere ha aka elu. Ndị Asiria gwara ndị Juu okwu dị iche iche ga-eme ka obi daa ha mbà ka ha chịliere ha aka elu.

  • Enweghị onye inye aka. Ijipt agaghị enyeliri unu aka.—Aịza. 36:6

  • Obi abụọ. Jehova agaghị alụrụ unu ọgụ n’ihi na unu akpasuola ya iwe.—Aịza. 36:7, 10

  • Iyi egwu. Ndị agha Asiria ka unu ike. Unu agaghị emerili ha.—Aịza. 36:8, 9

  • Uru ha ga-erite. Ndụ unu ga-aka mma ma unu chịliere ndị Asiria aka elu.—Aịza. 36:16, 17

Hezekaya nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ

37:1, 2, 14-20, 36

  • O mere ihe niile o nwere ike ime iji kwadebe maka ichebe Jeruselem ma ndị Asiria bịa nọchibido ha

  • Ọ rịọrọ Jehova ka ọ napụta ha, gwakwa ndị obodo ya ka ha mee otu ihe ahụ

  • Jehova zọpụtara ndị Juu n’ihi okwukwe ya mgbe o zitere otu mmụọ ozi ka o gbuo ndị agha Asiria dị 185,000 n’otu abalị