Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Jenụwarị 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

ỤLỌ NCHE

Ajụjụ: Ụfọdụ ndị chere na ihe e dere na Baịbụl abaghịzi uru taa, ndị ọzọ echee na ọ ka bara uru. Olee ihe gịnwa chere?

Amaokwu Baịbụl: 2 Tim. 3:16, 17

Otú a ga-esi enye ya: Ụlọ Nche a gwara anyị ụzọ dị iche iche Baịbụl si baa uru taa, gwakwa anyị ihe anyị ga-eme ka anyị na-erite ezigbo uru n’ọgụgụ Baịbụl anyị.

NA-AKỤZI EZIOKWU

Ajụjụ: Ọgwụgwụ ụwa a ọ̀ dịla nso?

Amaokwu Baịbụl: Mat. 24:3, 7, 14

Eziokwu: Amụma Baịbụl gosiri na anyị bi n’oge ikpeazụ. Ma, ọ bụụrụ anyị ozi ọma n’ihi na ọ na-egosi na ihe ga-aka mma n’oge na-adịghị anya.

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Ajụjụ: Ụfọdụ chere na ihe mere Chineke ji kee ụwa bụ ka o jiri ya mere ebe ọ ga na-ele ndị mmadụ ule ka ọ mata ndị kwesịrị iso ya biri n’eluigwe, olee ihe gịnwa chere?

Otú a ga-esi enye ya: Broshọ a kọwara ihe ndị mere ka ọtụtụ ndị kweta na Chineke kere ụwa a ka mmadụ biri na ya ruo mgbe ebighị ebi. M ga-achọ ịbịaghachi ka anyị tulee ajụjụ nke mbụ dị na peeji nke 10: “Gịnị mere Chineke ji kee ụwa?”

DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.