Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Onye na-ezi ozi ọma na Gana

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ JENỤWARỊ 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche, nakwa otú e nwere ike isi jiri ebe sịrị Na-akụzi Eziokwu mee ka mmadụ mata nke bụ eziokwu banyere ihe ndị na-eme n’oge ikpeazụ. Dee otú ị ga-esi eme nke gị

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jehova Na-elekọta Ndị Ya

Jehova na-enyeju anyị nri ime mmụọ afọ otú ahụ onye na-emesapụ aka na-emere onye ọbịa ya.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“Otu Eze Ga-achị Ka E Wee Nwee Ezi Omume”

Eze Jizọs na-ahọpụta ndị okenye ga na-elekọta ìgwè atụrụ ya. Ha na-eji Okwu Chineke eduzi ìgwè atụrụ Chineke ma na-eme ka ha nweta ume.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

A Zọpụtara Ndị Chineke n’Ihi Okwukwe Hezekaya

Ndị Asiria gwara ndị Juu okwu dị iche iche ga-eme ka obi daa ha mbà ka ha chiliere ha aka elu, ma Jehova zitere otu mmụọ ozi ka o chebe Jeruselem.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

“Jehova, . . . Ọ Bụ Gị ka M Tụkwasịrị Obi”

Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ma mgbe ihe dịịrị anyị mma ma mgbe ihe siiri anyị ike. Olee otú Hezekaya si gosi na ya tụkwasịrị Chineke obi?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jehova Na-enye Onye Ike Gwụrụ Ike

E nwere ike iji otú a ikuku ọkụ si enyere ugo aka ịna-erugharị tụnyere otú Chineke si enye anyị ike anyị ga-eji nọgide na-efe ya.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Cheta Ịna-etinye Ndị Kraịst A Na-akpagbu n’Ekpere

Olee otú anyị nwere ike isi kpee ekpere maka ụmụnna anyị ndị a na-akpagbu?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jehova Bụ Chineke nke Amụma

Jehova si n’ọnụ Aịzaya kwuo ihe ga-eme Babịlọn ihe dị ka narị afọ abụọ tupu ihe ahụ emee.