Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Jenụwarị 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 29-32

Anyị Ga Na-arụsi Ọrụ Ike Ka Anyị Na-efe Chineke

Anyị Ga Na-arụsi Ọrụ Ike Ka Anyị Na-efe Chineke
OTÚ O SI EGOSI YA
Text
Image

Mbọ Hezekaya gbara mere ka ndị Juu maliteghachi ife Jehova

29:10-17

  • 746-716 T.O.N.K.

    Oge Hezekaya Chịrị

  • NAỊSAN 746 T.O.N.K.

    • Ụbọchị nke 1-8: O dewere ogige ụlọ nsọ ọcha

    • Ụbọchị nke 9-16: O dewere ụlọ Jehova ọcha

    • E kpuchiiri Izrel dum mmehie ha ma mee ka ha maliteghachi ife Jehova

  • 740 T.O.N.K.

    Mgbe E Bibiri Sameria

Hezekaya kpọrọ ndị niile obi ha dị n’ife Jehova ka ha zukọta ọnụ fee Chineke

30:5, 6, 10-12

  • Ọ gwara ndị ọgba ọsọ ka ha gaa kesaara ndị mmadụ akwụkwọ ozi malite na Bia-shiba ruo na Dan iji kpọọ ha òkù ka ha zukọọ maka Ememme Ngabiga

  • Ọtụtụ ndị zara òkù ahụ n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị kwara ndị ọgba ọsọ ahụ emo