Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Jenụwarị 2016

Jenụwarị 4-10

2 IHE E MERE 29-32

Jenụwarị 4-10
  • Abụ nke 114 na Ekpere

  • Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

  • Otú Anyị Ga-esi Zie Ndị Mmadụ Ozi Ọma n’Ọnwa A: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ kpọnye vidio nke mbụ na-egosi otú a ga-esi nye ndị mmadụ Ụlọ Nche. E kirichaa ya, a tụlee otú onye nkwusa e gosiri na ya si kwulite ihe ya na onye o ziri ozi ọma ga-atụle n’ụbọchị ọzọ. A ga-akpọnyekwa vidio nke abụọ maka Ụlọ Nche, kpọnyekwa nke Ozi Ọma Si n’Aka Chineke ma tụlee ha otú ahụ e si tụlee nke mbụ. Gwa ụmụnna gbasara isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Jiri Broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl.” Gbaakwa ha ume ka ha dee otú ọzọ ha nwere ike isi zie mmadụ ozi ọma.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

  • Abụ nke 127

  • Ịrụ na Ilekọta Ebe Ndị Anyị Na-anọ Efe Chineke Bụ Ihe Ọma Chineke Meere Anyị”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe ụfọdụ mere ha obi ụtọ mgbe ha so na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Gbaakwa nwanna na-ahụ maka ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ajụjụ ọnụ. Ọ ga-ekwu otú o si arụ ọrụ ya.

  • Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: ia isi nke 6 ¶1-14 (Nkeji 30)

  • Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)

  • Abụ nke 142 na Ekpere

    Chetakwa na a ga-ebu ụzọ kpọnyere ọgbakọ abụ ọhụrụ a ka ha gee. Ya kpọchaa, gwa ụmụnna ka ha bụzie ya.