Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Febụwarị 2017

Febụwarị 6-12

AỊZAYA 47-51

Febụwarị 6-12
  • Abụ nke 120 na Ekpere

  • Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

  • Irubere Jehova Isi Na-eweta Ọtụtụ Ngọzi”: (Nkeji 10)

    • Aịza. 48:17—Ndị na-efe ezi ofufe na-erube isi n’iwu Chineke (ip-2 131 ¶18)

    • Aịza. 48:18—Jehova hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka ndụ na-atọ anyị ụtọ (ip-2 131 ¶19)

    • Aịza. 48:19—Irubere Jehova isi ga-eme ka anyị nweta ngọzi ebighị ebi (ip-2 132 ¶20-21)

  • Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)

    • Aịza. 49:6—Olee otú Mesaya ahụ si bụrụ “ìhè nke mba niile” n’agbanyeghị na ọ bụ naanị ụmụ Izrel ka o jeere ozi elu ala ya? (w07 1/15 9 ¶8)

    • Aịza. 50:1—Gịnị mere Jehova ji jụọ ụmụ Izrel, sị: “Olee akwụkwọ m ji gbaa nne unu m chụpụrụ achụpụ alụkwaghịm?” (it-1-E 643 ¶4-5)

    • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?

    • Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?

  • Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Aịza. 51:12-23

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

  • Kwadebe Otú Anyị Ga-esi Zie Ozi Ọma n’Ọnwa A: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.” Kpọnye vidio ndị na-egosi otú anyị ga-esi ezi ozi ọma n’ọnwa a. E lechaa nke ọ bụla, a tụlee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na ya. N’ọnwa Febụwarị, ndị nkwusa nwekwara ike inye ndị mmadụ broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Ma, ọ bụrụ na ha ahụ nwa akwụkwọ a na-akụziri evolushọn, ya abụrụkwa na ọ chọrọ ịmata ihe gosiri na e nwere Onye Okike, ha nwere ike inye ya broshọ bekee bụ́ The Origin of Life—Five Questions Worth Asking. (Gụọ igbe aha ya bụ “Broshọ The Origin of Life—Five Questions Worth Asking.”) Gbaa ụmụnna ume ka jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ kpọnyere ndị mmadụ vidio aha ya bụ È Kere Ihe Ndị Dị Ndụ Eke?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

  • Abụ nke 89

  • Mkpa Ọgbakọ: (Nkeji 7) Ma ọ bụ unu atụlee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị a kọrọ n’Akwụkwọ Mgbaafọ. (yb16 144-145)

  • Bụrụ Enyi Jehova—Na-erubere Jehova Isi: (Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio Bụrụ Enyi Jehova—Na-erubere Jehova Isi. E lechaa ya, jụọ ụmụnna ajụjụ ndị a: Olee ihe kacha mkpa mere anyị kwesịrị iji na-erubere Jehova isi? (Ilu 27:11) Olee ihe ụfọdụ ụmụaka ga na-eme iji rubere Jehova isi? Olee ihe ụfọdụ ndị dimkpa ga na-eme iji rubere Jehova isi?

  • Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) kr isi nke 8 ¶1-7, na igbe dị na peeji nke 79

  • Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)

  • Abụ nke 98 na Ekpere