Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Febụwarị 2017

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | AỊZAYA 63-66

Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ Ga-eme Ka E Nwee Oké Ọṅụ

Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ Ga-eme Ka E Nwee Oké Ọṅụ

Nkwa Jehova kwere n’Aịzaya isi 65 ga-emezurịrị. Jehova kwudịrị ya ka à ga-asị na o meela emee.

Jehova ga-eme ka e nwee eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, ebe ndị nọ na ya na-agaghị echeta ihe mbụ niile

65:17

Gịnị bụ eluigwe ọhụrụ?

  • Ọ bụ ọchịchị ọhụrụ ga-eme ka ezi omume dịrị n’ụwa

  • E hiwere ya n’afọ 1914 mgbe e chiri Kraịst eze nke Alaeze Chineke

Gịnị bụ ụwa ọhụrụ?

  • Ọ bụ ụmụ mmadụ ndị si ná mba dị iche iche, asụsụ dị iche iche nakwa agbụrụ dị iche iche. Ha ji obi ha niile na-erubere ọchịchị Chineke isi

Olee otú o si bụrụ na ihe mbụ niile agaghị abatakwa n’obi?

  • Ihe ndị ahụ na-akpatara ndị mmadụ obi ọjọọ, ya bụ, ahụhụ, nchekasị, na obi mgbawa agaghị adịkwa ọzọ

  • Ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi ga-anụ ụtọ ndụ. Ụbọchị ọ bụla ga na-emekwa ha obi ụtọ