Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Febụwarị 2017

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Ahụ

Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Ahụ

Olileanya dị ka arịlịka. (Hib. 6:19) Ọ na-enyere anyị aka ka okwukwe anyị ghara ikpu ka ụgbọ ma nsogbu bịara anyị. (1 Tim. 1:18, 19) Nsogbu ndị ahụ nwere ike ịbụ na ihe ndị anyị tụrụ anya ha emeghị, na ihe anyị nwere funahụrụ anyị, na anyị na-arịa ọrịa na-ekweghị ala ala, na mmadụ nwụnahụrụ anyị ma ọ bụkwanụ na ihe ọzọ nwere ike ịkpa okwukwe anyị aka ọjọọ mere anyị.

Okwukwe na olileanya na-eme ka anyị lekwasị anya n’ụgwọ ọrụ e kwere anyị ná nkwa. (2 Kọr. 4:16-18; Hib. 11:13, 26, 27) N’ihi ya, ma ànyị nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa, anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche ná nkwa ndị ahụ e dere na Baịbụl ka olileanya anyị nwee ike sikwuo ike. Ọ bụruzie na nsogbu abịara anyị, ọ ga-adịrị anyị mfe idi ya ma nọgide na-enwe obi ụtọ.—1 Pita 1:6, 7.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-AṄỤRỊNỤ ỌṄỤ N’OLILEANYA AHỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị mere Mozis ji bụrụ onye e kwesịrị iṅomi?

  • Olee ọrụ dịịrị ndị isi ezinụlọ?

  • Olee ihe ụfọdụ unu nwere ike iji mee Ofufe Ezinụlọ?

  • Olee otú olileanya ga-esi nyere gị aka inwe obi ike ma ọnwụnwa bịara gị?

  • Olee ihe ị na-atụ anya ya n’Alaeze Chineke?