Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Febụwarị 2017

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Nyere Ụmụ Gị Aka Inwe Okwukwe Siri Ike n’Ebe Onye Okike Nọ

Nyere Ụmụ Gị Aka Inwe Okwukwe Siri Ike n’Ebe Onye Okike Nọ

Ihe ndị e kere eke na-akọsa ebube Chineke. (Ọma 19:1-4; 139:14) Ma, ụwa Ekwensu a anyị bi na ya na-akụziri ndị mmadụ ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere otú ndụ si bido. (Rom 1:18-25) Olee otú ị ga-esi mee ka ụdị nkụzi ndị a ghara ịgbanye mgbọrọgwụ n’obi ụmụ gị? Bido mgbe ha dị ntakịrị mee ka ha ghọta na Jehova dị adị, nakwa na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi. (2 Kọr. 10:4, 5; Efe. 6:16) Gbalịa mata ihe ha chere gbasara ihe a na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ. Jirikwa ihe dị iche iche ọgbakọ Jehova na-emepụta kụziere ha nke bụ́ eziokwu.—Ilu 20:5; Jems 1:19.

LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU—IKWERE NA CHINEKE. ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ kweere banyere Chineke?

  • Gịnị ka a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ unu?

  • Gịnị mere i ji kweta na Jehova dị adị?

  • Olee otú ị ga-esi nyere mmadụ aka ikweta na ọ bụ Chineke kere ihe niile?