Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Febụwarị 2017

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | AỊZAYA 52-57

Kraịst Tara Ahụhụ n’Ihi Anyị

Kraịst Tara Ahụhụ n’Ihi Anyị

“Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya . . . Anyị gụrụ ya n’onye e tiri ihe otiti, onye Chineke tiri ihe, mekpaakwa ahụ́”

53:3-5

  • E ledara Jizọs anya, sịkwa na ọ na-ekwulu Chineke. Ụfọdụ kweere na Chineke tiri ya ihe otiti, jirikwa ọrịa ọjọọ na-emekpa ya ahụ́

“Ma ọ tọrọ Jehova ụtọ igwepịa ya. . . . Ihe na-atọ Jehova ụtọ ga-aga nke ọma n’aka ya”

53:10

  • O doro anya na o wutere Jehova mgbe ọ hụrụ na e gbuola Ọkpara ya. Ma, obi dị ya ụtọ na Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. O mere ka Jehova nwee ihe ọ ga-aza Setan, bụ́ onye na-ekwu na o nweghị ohu Chineke ga-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. O mekwara ka ndị chegharịrị echegharị nwee olileanya ịdị ndụ. Ọnwụ Jizọs si otú ahụ mee ihe “tọrọ Jehova ụtọ”