Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Febụwarị 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

TETA!

Ajụjụ: Ihe ndị na-eme eme na-egosi na ọtụtụ ndị na-eto eto na-adazi mbà n’obi. Gịnị ka e nwere ike ime maka ya?

Otú a ga-esi enye ya: Teta! a kwuru ihe ndị ga-enyere ndị na-eto eto aka ịkwụsị ịna-ada mbà n’obi, nakwa ihe ndị mụrụ ha nwere ike ime iji nyere ha aka.

NA-AKỤZI EZIOKWU

Ajụjụ: Olee ihe ndị na-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo?

Amaokwu Baịbụl: Efe. 5:33

Eziokwu: Di na nwunye ga na-ebi n’udo ma ha hụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù.

GEE CHINEKE NTỊ KA I WEE DỊ NDỤ EBIGHỊ EBI (ll)

Ajụjụ: Ndị ụfọdụ leechaa ihe ndị dị ịtụnanya dị n’eluigwe na n’ụwa, ha na-eto ihe ndị ahụ maka otú ha si maa mma. Ma, olee onye ị ga-asị na ọ bụ ya ka e kwesịrị ito maka ihe ndị ahụ?

Amaokwu Baịbụl: Mkpu. 4:11

Otú a ga-esi enye ya: Dị ka ebe a anyị gụrụ si kwuo, ọ bụ Chineke ka anyị kwesịrị ito maka ihe ndị dị ịtụnanya o kere. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka a kọwara na peeji nke 7 na broshọ a.

DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.