Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ebe otu nwanna nwaanyị na-eto eto na-akọrọ ụmụ klas ha ihe o dere

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Febụwarị 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Otú e nwere ike isi nye mmadụ Teta!, nakwa otú e nwere ike isi jiri ebe sịrị Na-akụzi Eziokwu mee ka mmadụ mata ihe ndị ga-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo. Dee otú ị ga-esi eme nke gị.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Irubere Jehova Isi Na-eweta Ọtụtụ Ngọzi

Jehova na-egosi anyị ụzọ anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Kraịst Tara Ahụhụ n’Ihi Anyị

Ọnwụ Jizọs mere ka Jehova nwee ihe ọ ga-aza Setan, bụ́ onye na-ekwu na o nweghị ohu Chineke ga-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Nyere Ụmụ Gị Aka Inwe Okwukwe Siri Ike n’Ebe Onye Okike Nọ

Gịnị ka ụmụ gị kweere gbasara otú ndụ si malite? Olee otú ị ga-esi nyere ha aka ịmata na ọ bụ Chineke kere ihe niile?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

‘Kpọsaa Afọ Jehova Na-egosi Ihu Ọma Ya’

Afọ Jehova na-egosi ihu ọma ya ọ̀ bụ afọ nkịtị? Olee otú ahụ oge ahụ si gbasa ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Enyefusila Akwụkwọ Anyị Aghara Aghara

Ọ dịghị mfe ibipụta akwụkwọ anyị na ibuga ha n’ọgbakọ anyị dị iche iche n’ụwa. Ọ na-efukwa nnukwu ego. N’ihi ya, enyela onye ọ bụla ị hụrụ akwụkwọ anyị.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ Ga-eme Ka E Nwee Oké Ọṅụ

Olee uru nkwa Chineke kwere anyị gbasara “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ga-abara anyị?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Ahụ

Olileanya dị ka arịlịka. Ịtụgharị uche ná nkwa ndị Chineke kwere anyị ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịna-enwe obi ụtọ, na ijidesi okwukwe anyị ike ma ọnwụnwa bịara anyị.