OTÚ O SI EGOSI YA
Text
Image

Febụwarị 22-28

N’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Febụwarị, anyị ga-amalite ịkpọ ndị nọ́ n’ókèala anyị òkù ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Ọ bụrụ na anyị enweta onye nwere mmasị ịbịa, anyị kwesịrị inyere ya aka ka ọ bịa.

IHE NDỊ ANYỊ NWERE IKE IME

OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI KPỌỌ MMADỤ ÒKÙ

“Anyị bịara ịgwa unu gbasara ihe dị mkpa anyị ga-eme n’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Mach. N’ụbọchị ahụ, nde kwuru nde ndị mmadụ ga-agbakọ n’ebe dị iche iche icheta ọnwụ Jizọs. A ga-eji Baịbụl kọwaara anyị uru ọnwụ Jizọs nwụrụ baara anyị. E dere ebe anyị ga-anọ eme ya na oge anyị ga-eme ya ná mpempe akwụkwọ a. Biko, gbalịa ka ị bịa.”

E nwere ike ime otu n’ime ihe abụọ ndị a ma ọ bụrụ na onye ahụ nwere mmasị

  • NYE ONYE AHỤ ỤLỌ NCHE

    Gwakwa ya ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.

  • KPỌNYERE YA VIDIO GBASARA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS

    Gwakwa ya ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.

E nwere ike ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ma a gaghachi na nke onye ahụ

  • KPỌNYERE YA VIDIO BỤ́ OLEE URU ỊMỤ BAỊBỤL GA-ABARA GỊ?

    Nyezie ya otu n’ime akwụkwọ ndị anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl.

  • NYE YA AKWỤKWỌ GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ?

    Jiri ihe nke 16 e dere ná ngwụcha ya kọwakwuoro ya gbasara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Nyezie ya akwụkwọ ahụ.

  • NYE YA BROSHỌ GEE CHINEKE NTỊ

    Jirinụ peeji nke 18 na nke 19 tụlee uru ọnwụ Jizọs bara. Nyezie ya broshọ ahụ.