Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Febụwarị 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ndụ Kacha Mma Mmadụ Nwere Ike Ibi

Ndụ Kacha Mma Mmadụ Nwere Ike Ibi

O nwere ọtụtụ ụzọ ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ Jehova nwere ike isi jeere ya ozi. Kirie vidio bụ́ Ndụ Kacha Mma Mmadụ Nwere Ike Ibi ka ị hụ otú otu nwa agbọghọ aha ya bụ Cameron si jiri oge ya jeere Jehova ozi. I kirichaa vidio a, zaa ajụjụ ndị a dị́ ebe a. (Ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa NDỊ NA-ETO ETO ka ị hụ vidio a.)

  • Gịnị kacha Cameron mkpa ná ndụ ya?

  • Olee mgbe o kpebiri ijekwuru Jehova ozi? Oleekwa otú o si mee ya?

  • Olee otú o si kwadebe maka ịkwaga obodo ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma?

  • Olee ihe ndị nyere Cameron nsogbu n’ebe ahụ ọ gara izi ozi ọma?

  • Olee uru dị́ na mmadụ ịga jeere Jehova ozi n’obodo ọzọ ma ọ bụkwanụ n’ebe ọzọ ọ na-anọtụbeghị?

  • Olee uru ozi ahụ Cameron nọ na-aga baara ya?

  • Gịnị mere mmadụ iji ndụ ya jeere Jehova ozi ji bụrụ ụdị ndụ kacha mma onye ahụ nwere ike ibi?

  • Olee ụzọ ndị ọzọ ndị na-eto eto nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi?