Ime ndị na-eso ụzọ dị ka ịrụ ụlọ. Iji bụrụ aka ochie n’ịrụ ụlọ, anyị kwesịrị ịmụta otú e si ejizi ngwá ọrụ anyị ejizi. Anyị kwesịkwara ịmụta otú e si eji ngwá ọrụ bụ́ isi anyị ji ekwusa ozi ọma bụ́ Okwu Chineke ejizi. (2 Tim. 2:15) Anyị ga na-ejikwa akwụkwọ na vidio dị iche iche so n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe akụzi ihe nke ọma, ka anyị nwee ike ime ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ. *

Olee otú ị ga-esi mụtakwuo iji Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe na-akụzi ihe nke ọma? (1) Gwa onye nlekọta ìgwè ozi ubi unu ka o nyere gị aka, (2) gị na onye nkwusa ma nke a na-akọ ma ọ bụ ọsụ ụzọ soro na-arụ n’ozi ọma. (3) Na-eme ihe ị na-amụta. Ka ị na-amụta iji akwụkwọ na vidio ndị a na-akụzi ihe nke ọma, ozi gị ga na-eme gị obi ụtọ.

ỤLỌ NCHE NA TETA!

BROSHỌ

AKWỤKWỌ

TRAKTỊ

VIDIO

AKWỤKWỌ ỊKPỌ ÒKÙ

KAADỊ JW.ORG

^ para. 3 Akwụkwọ ole na ole na-esoghị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe bụ akwụkwọ ndị e bu ndị ụfọdụ n’obi dee. E nwekwara ike inye ha mmadụ, ma ọ dị mkpa.