3:​1-5

Olee ihe mere àgwà ndị ndú okpukpe ndị Juu ji wee Jizọs iwe? Ọ bụ n’ihi na ha ji ọtụtụ obere iwu ha tụkwasịrị n’iwu Ụbọchị Izu Ike mee ka ọ ghọọrọ ndị mmadụ ibu arọ. Dị ka ihe atụ, ha machiri igbu àkpịrị́ n’Ụbọchị Izu Ike. E nwere ike ịgwọ mmadụ ọrịa naanị ma onye ahụ ọ̀ nọ n’ọnụ ọnwụ. Nke a pụtara na a gaghị agba mmadụ ọkpụkpụ n’Ụbọchị Izu Ike. O doro anya na ndị ndú okpukpe ahụ enweghị ọmịiko ọ bụla n’ebe nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọ.