Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Disemba 2017

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ZEFANAYA 1–HAGAỊ 2

Chọọnụ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe Ya

Chọọnụ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe Ya

Zef. 2:2, 3

Ka Jehova nwee ike ichebe anyị n’ụbọchị iwe ya, anyị kwesịrị ime ihe karịrị naanị inyefe ya onwe anyị. Anyị kwesịrị irube isi n’ihe ahụ Zefanaya gwara ụmụ Izrel.

  • Chọọ Jehova: Mee ka gị na Jehova dịrị ná mma. Sorokwa nzukọ ya na-emekọ ihe

  • Chọọ ezi omume: Na-eme ihe Jehova kwuru

  • Chọọ ịdị umeala n’obi: Jiri umeala n’obi na-erubere Jehova isi, dịrịkwa njikere ịnabata ịdọ aka ná ntị ya

Olee otú m ga-esi na-achọ Jehova, ezi omume na ịdị umeala n’obi karịa otú m na-emebu?