Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Disemba 2017

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Otú E Si Amata Ezigbo Ịhụnanya?

Olee Otú E Si Amata Ezigbo Ịhụnanya?

Jehova mere alụmdi na nwunye ka ọ bụrụ ihe ga-ejikọ nwoke na nwaanyị ruo mgbe ebighị ebi. (Jen. 2:22-24) Ihe naanị nwere ike ime ka ha gbaa alụkwaghịm bụ ịkwa iko. (Mal. 2:16; Mat. 19:9) Ebe ọ bụ na Jehova chọrọ ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ, ọ gwara Ndị Kraịst ihe ndị ga-enyere ha aka ịkpachapụ anya mgbe ha na-ahọrọ onye ha ga-alụ, nakwa ihe ndị ga-enyere di na nwunye aka ịna-enwe obi ụtọ.—Ekli. 5:4-6.

LEENỤ VIDIO BỤ́ OLEE OTÚ E SI AMATA EZIGBO ỊHỤNANYA?, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe mere ndụmọdụ nne na nna Liz nyere ya ji gosi na ha hụrụ ya n’anya?

  • Olee ihe mere na anyị ekwesịghị ichewe na anyị ga-agbanweli àgwà ọjọọ onye anyị chọrọ ịlụ nwere?

  • Olee ndụmọdụ di na nwunye ahụ mere agadi nyere Liz?

  • Gịnị kpatara nsogbu n’alụmdi na nwunye Zach na Mary?

  • Olee ihe ndị John na Liz chọrọ ime n’ofufe Chineke?

  • Gịnị mere o ji dị mma ka i buru ụzọ mata “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi” nke onye gị na ya na-akpa tupu gị ekwewe ya nkwa ọlụlụ? (1 Pita 3:4)

  • Olee otú e si amata ezigbo ịhụnanya? (1 Kọr. 13:4-8)