Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Disemba 2017

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ZEKARAYA 9-14

Nọrọnụ na “Ndagwurugwu nke Ugwu M”

Nọrọnụ na “Ndagwurugwu nke Ugwu M”

14:3-5

Jehova mere ka e nwee “nnukwu ndagwurugwu” mgbe o hiwere Alaeze Mesaya n’afọ 1914. Alaeze Mesaya ahụ bụ “ugwu” nọ n’okpuru ọchịchị Jehova. Kemgbe afọ 1919, ndị ohu Chineke na-enweta nchebe na “ndagwurugwu nke ugwu” ahụ

Olee otú ndị mmadụ si “agbaga na ndagwurugwu” ahụ Jehova ji echebe anyị?

14:12, 15

A ga-ebibi onye ọ bụla na-anọghị na ndagwurugwu ahụ nọchiri anya otú Chineke si echebe anyị n’Amagedọn

Olee otú m ga-esi nọrọ na ndagwurugwu ahụ Jehova ji echebe anyị?