Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Disemba 2017

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Izi Mmadụ Niile Nọ n’Ókèala Anyị Ozi Ọma

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Izi Mmadụ Niile Nọ n’Ókèala Anyị Ozi Ọma

IHE MERE O JI DI MKPA: Zekaraya buru amụma na ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ dị iche iche si ná mba dị iche iche ga-anabata ozi ọma. (Zek. 8:23) Ma, ònye ga-eme ka ha nụ ya? (Rom 10:13-15) Obi dị anyị ụtọ na Chineke dunyere anyị ka anyị gaa zie mmadụ niile nọ n’ókèala anyị ozi ọma alaeze ya.—od 84 ¶10-11.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Kwadebe akwadebe. Ọ bụrụ na ị na-ahụkarị ndị na-asụ asụsụ ọzọ, i nwere ike isi na JW Language app mụta ihe ndị dị mfe ị ga-eji zie ha ozi ọma. Ma ọ bụkwanụ gị e jiri ekwentị gị gosi ha otú ha ga-esi nweta ihe ndị e dere n’asụsụ ha na jw.org

  • Na-eleru anya ala. Ọ bụrụ na ị nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ, leruo anya ka ị ghara ịhapụ izi ndị na-agafe n’okporo ụzọ na ndị nọ n’ụgbọala ha ozi ọma. Ị nọrọ n’ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo, ekwela ka ihe ọ bụla dọpụ gị uche n’ozi ọma ị bịara izi

  • Dịrị uchu. Gbalia na-agaghachi na nke ndị ị na-enwetaghị n’ụlọ mgbe mbụ ị gara na nke ha. Jisie ike ka i zie ndị bi n’ụlọ ọ bụla ozi ọma. I nwere ike ịgbanwe oge ma ọ bụ ụbọchị ị na-ejibu aga na nke ha. O nwere ike ịka mma ka i degara ụfọdụ ndị nwe ụlọ akwụkwọ ozi, kpọọ ha n’ekwentị ma ọ bụkwanụ gị ahụ ha mgbe ị na-agba àmà n’okporo ámá

  • Gaghachi na nke ndị nwere mmasị. Egbula oge ịgaghachi na nke ndị gosiri mmasị. Ọ bụrụ na onye ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, chọtara ya onye nkwusa na-anụ asụsụ ahụ ga-enyere ya aka. Akwụsịla ịna-aga na nke ya ruo mgbe ị hụrụ na onye nkwusa na-anụ asụsụ ya ebidola ịga na nke ya.—od 94 ¶39-40

LEENỤ VIDIO BỤ́ IKWUSA OZI ỌMA “N’EBE KASỊ ANYA N’ỤWA.” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú ụmụnna ndị a si jikere maka ịga zie ndị bi n’ókèala dịpụrụ adịpụ ozi ọma? (1 Kọr. 9:22, 23)

  • Olee ihe isi ike ndị ha meriri?

  • Olee otú Jehova si gọzie ha?

  • Olee ihe ndị i nwere ike ime iji nwetakwuo ndị ị ga-ezi ozi ọma n’ókèala unu?