Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Ebe ụmụnna anyị na-ezi ozi ọma n’otu ahịa dị na Siera Lion

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Disemba 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Otú e nwere ike isi nye mmadụ Teta nakwa otú e nwere ike isi jiri ebe sịrị Na-akụzi Eziokwu kụziere mmadụ nke bụ́ eziokwu banyere ọnwụ. Dee otú ị ga-esi eme nke gị.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Chọọnụ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe Ya

Ka Jehova nwee ike ichebe anyị n’ụbọchị iwe ya, anyị kwesịrị ime ihe karịrị naanị inyefe ya onwe anyị. Anyị kwesịrị irube isi n’ihe ahụ Zefanaya gwara ụmụ Izrel.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

‘Jide Uwe Mwụda nke Nwoke Bụ́ Onye Juu Aka’

Ọtụtụ ndị si ná mba dị iche iche na-enubata n’ọgbakọ Jehova iji soro ndị e tere mmanụ fee ya ofufe. Olee ụzọ ụfọdụ e si na-akwado ndị e tere mmanụ taa?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Izi Mmadụ Niile Nọ n’Ókèala Anyị Ozi Ọma

Anyị chọrọ ka anyị zie mmadụ niile nọ n’ókèala anyị ozi ọma. Ma, olee otú anyị ga-esi eme ya?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Nọrọnụ na “Ndagwurugwu nke Ugwu M”

Gịnị ka ‘ndagwurugwu nke ugwu’ ahụ nọchiri anya ya? Olee otú ndị mmadụ ga-esi agbaba na ndagwurugwu ahụ ma nọrọ ebe ahụ?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Ọhụrụ Ga Na-adịzi n’Ọmụmụ Ihe Etiti Izu Anyị

Jirinụ ihe ụfọdụ a kọwara na foto na ihe ndị ọzọ dị na Baịbụl Nsụgharị Ụwa ọhụrụ a na-amụ amụ mee ka nkwadebe ọmụmụ ihe unu kakwuo mma, meekwa ka unu bịarukwuo Jehova nso.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Alụmdi na Nwunye Gị Ọ̀ Na-eme Jehova Obi Ụtọ?

N’oge Malakaị, Jehova anabataghị ofufe ndị ahụ ji aghụghọ gbaa di ha ma ọ bụ nwunye alụkwaghịm. Olee otú ndị lụrụ di na nwunye ga-esi ghara ịgba di ha ma ọ bụ nwunye ha alụkwaghịm n’ihi ihe na-enweghị isi na ọdụ?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Otú E Si Amata Ezigbo Ịhụnanya?

Jehova mere alụmdi na nwunye ka ọ bụrụ ihe ga-ejikọ nwoke na nwaanyị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gwara Ndị Kraịst ihe ndị ga-enyere ha aka ịkpachapụ anya mgbe ha na-ahọrọ onye ha ga-alụ, nakwa ihe ndị ga-enyere di na nwunye aka ịna-enwe obi ụtọ.