Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Disemba 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | AỊZAYA 1-5

“Ka Anyị Gbagoo n’Ugwu Jehova”

“Ka Anyị Gbagoo n’Ugwu Jehova”

2:2, 3

“Ọ ga-eru n’oge ikpeazụ”

Oge a anyị nọ na ya ugbu a

“Ugwu nke ụlọ Jehova”

Ofufe Jehova dị́ ọcha

“Mba niile ga-enubakwa n’ime ya”

Ndị na-efe ofufe dị́ ọcha na-efekọ Chineke ọnụ

“Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova”

Ndị na-efe ofufe dị́ ọcha na-akpọ ndị ọzọ ka ha bịa soro ha

“Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya”

Jehova ji Okwu ya na-akụziri anyị ihe ndị na-enyere anyị aka ịna-eje ije n’ụzọ ya

2:4

“Ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha”

Aịzaya kọwara otú a ga-esi agbanwe ngwá agha ka ọ ghọọ ihe ndị e ji arụ ọrụ n’ubi. Nke a na-egosi na Ndị Kraịst ga-abụ ndị na-eme udo. Olee ihe ndị e ji alụ agha n’oge Aịzaya?

‘Mma agha ka ha bụrụ mma ogè’

1 A na-etinye mma ogè n’osisi e ji akọ ala anụmanụ na-adọkpụ. A na-eji ọla kọpa ma ọ bụ ọla nchara arụ ụfọdụ n’ime ha.—1 Sam. 13:20

‘Ube ka ha bụrụ mma ịkwa osisi’

2 Mma ịkwa osisi na-adị ka mma a e sere ebe a. A na-eji ụdị mma a akwa osisi vaịn.—Aịza. 18:5