Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ DISEMBA 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Na-emeri Ịkpa Ókè Agbụrụ

Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Na-emeri Ịkpa Ókè Agbụrụ

Jehova anaghị akpa ókè. (Ọrụ 10:34, 35) Ọ na-anabata “ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile pụta.” (Mkpu. 7:9) N’ihi ya, ọgbakọ Ndị Kraịst anaghị akwado ịkpa ókè agbụrụ ma ọ bụ ile mmadụ anya n’ihu. (Jems 2:1-4) Obi dị anyị ụtọ na ihe Chineke na-akụziri anyị emeela ka ndị nọ́ n’ọgbakọ ya gbanwee ndụ ha, nọrọzie na paradaịs ime mmụọ. (Aịza. 11:6-9) Ọ bụrụ na anyị agbalịa wepụ ikpa ókè agbụrụ n’obi anyị, anyị ga-abụ ndị na-eṅomi Chineke.—Efe. 5:1, 2.

LEENỤ VIDIO BỤ́ JOHNY NA GIDEON BỤBU NDỊ IRO, UGBU A HA BỤZI ỤMỤNNA. ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe mere nkụzi Chineke ji dị mma karịa mgbalị niile ndị mmadụ na-eme iji kwụsị ịkpa ókè agbụrụ na ile mmadụ anya n’ihu?

  • Olee ihe na-eme gị obi ụtọ gbasara ụmụnna anyị nọ́ n’ụwa dum?

  • Olee otú ịdị n’otu anyị si eme ka e too Jehova?