Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ DISEMBA 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | AỊZAYA 6-10

Mesaya Mezuru Amụma

Mesaya Mezuru Amụma
OTÚ O SI EGOSI YA
Text
Image

Ọtụtụ afọ tupu a mụọ jizọs, Aịzaya kwuru na Mesaya ahụ ga-ekwusa ozi ọma “n’ógbè Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ.” Jizọs mezuru amụma ahụ mgbe ọ gazuru Galili dum, na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ ihe.—Aịza. 9:1, 2.

  • Ọ rụrụ ọrụ ebube mbụ yaJọn 2:1-11 (na Kena)

  • Ọ họpụtara ndịozi yaMak 3:13, 14 (n’ebe dị nso na Kapaniọm)

  • O ziri Ozizi Elu Ugwu ahụMat. 5:1–7:27 (n’ebe dị nso na Kapaniọm)

  • Ọ kpọliteere otu nwaanyị di ya nwụrụ otu nwa nwoke ọ mụtaraLuk 7:11-17 (na Nen)

  • Ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ndị na-eso ụzọ ise mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ1 Kọr. 15:6 (na Galili)