Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Disemba 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

“Lee M! Ziga M”

“Lee M! Ziga M”

Anyị kwesịrị iṅomi ihe a Aịzaya mere wepụta onwe ya ịrụ ọrụ. O gosiri na o nwere okwukwe, wepụta onwe ya ije ozi a dị mkpa na-agbanyeghị na ọ machaghị ihe a chọrọ ka o mee. (Aịza. 6:8) Ì nwere ike ịhazi ihe ndị ị na-eme ka i nwee ike ịkwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa? (Ọma 110:3) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị ibu ụzọ “gbakọọ ihe ọ ga-efu.” (Luk 14:27, 28) Anyị kwesịkwara ịdị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ n’ihi ozi ọma. (Mat. 8:20; Mak 10:28-30) Dị ka anyị hụrụ na vidio ahụ bụ́ Ịkwaga n’Ebe A Chọkwuru Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma, ngọzi Jehova ga-agọzi anyị ga-akarị ihe ọ bụla anyị hapụrụ.

UNU LECHAA VIDIO AHỤ, ZAANỤ AJỤJỤ NDỊ A NA-ESONỤ:

  • Gịnị ka ndị ezinụlọ Williams mere iji nwee ike ịkwaga Ekwedọ?

  • Olee ihe ndị ha chebaara echiche tupu ha ekpebie ebe ha ga-akwaga?

  • Olee otú Jehova si gọzie ha?

  • Olee ebe i nwere ike isi chọta ihe ndị i kwesịrị ịma gbasara ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu?

N’OFUFE EZINỤLỌ ỌZỌ UNU GA-ENWE, TỤLEENỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú ezinụlọ anyị ga-esi jekwuoro Jehova ozi? (km 8/11 5-7)

  • Ọ bụrụ na anyị agaghị akwagali ebe e nwere mkpa ka ukwuu, olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji nyekwuo aka n’ọgbakọ anyị? (w16.03 3-5)