Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Ọgọst 2017

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-akpa Àgwà E Ji Mara Ndị Chineke​—⁠Ịdị Umeala n’Obi

Na-akpa Àgwà E Ji Mara Ndị Chineke​—⁠Ịdị Umeala n’Obi

IHE MERE O JI DI MKPA:

  • Ịdị umeala n’obi na-eme ka anyị na Jehova dịrị ná mma.​—Ọma 138:6

  • Ịdị umeala n’obi na-eme ka anyị na ndị ọzọ dịrị ná mma.​—Fil. 2:3, 4

  • Mpako na-eweta mbibi.​—Ilu 16:18; Ezik. 28:17

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Na-ajụ ndị ọzọ ebe ị ga-emezikwu ihe, na-emekwa ihe ha gwara gị.​—Ọma 141:5; Ilu 19:20

  • Na-ejere ndị ọzọ ozi ndị e ledara anya.​—Mat. 20:25-27

  • Ekwela ka nká ndị i nwere ma ọ bụ ọrụ e nyere gị buwe gị isi.​—Rom 12:3

Olee ụzọ ndị m nwere ike isi dịkwuo umeala n’obi?

LEENỤ VIDIO BÚ ZERE IHE NDỊ GA-EME KA Ị KWỤSỊ IGUZOSI IKE N’EBE JEHOVA NỌ​—⁠MPAKO, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:

  • Gịnị ka otú anyị si anabata ndụmọdụ na-egosi gbasara anyị?

  • Olee otú ekpere si enyere anyị aka ịna-adị umeala n’obi?

  • Olee ụzọ ụfọdụ ndị anyị si egosi na anyị dị umeala n’obi?