Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Ọgọst 2017

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Mgbe Ọzọ M Ga-arụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka?

Olee Mgbe Ọzọ M Ga-arụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka?

Ọhụụ Ezikiel hụrụ banyere ụlọ nsọ Jehova gosiri na anyị kwesịrị ịna-enye Jehova onyinye. Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi na-achụ àjà otuto?​—⁠Hib. 13:​15, 16.

Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. N’afọ ije ozi 2018, e nwere ọtụtụ ọnwa nwere Satọdee ise ma ọ bụ Sọnde ise. Ụmụnna ndị na-arụ ọrụ si na Mọnde ruo Fraịdee ma jiri Satọdee na Sọnde gaa ozi ọma ga-akacha erite uru n’ọnwa ndị a. Ihe ọzọ bụ na ndị nkwusa nwere ike ịhọrọ ịrụ awa iri atọ ma ọ bụ iri ise n’ọnwa Mach na Eprel, nakwa n’ọnwa onye nlekọta sekit ga-abịa ileta ha.

Ọ̀ bụrụkwanụ na anyị agaghị enweli ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ihi otú ihe si dịrị anyị? Anyị nwere ike ịgbalị mee ka otú anyị si ezi ozi ọma kakwuo mma, jirikwa oge bukwuru ibu gaa ozi ọma. Otú ọ bụla ihe si dịrị anyị, ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ mee ka anyị gbalịa ike anyị niile n’ozi ya n’afọ ije ozi 2018.​—⁠Hos. 14:⁠2.

Olee otú m ga-esi ṅomie ịnụ ọkụ n’obi Sabina Hernández?

LEENỤ VIDIO BỤ́ JEHOVA NA-ENYERE M AKA IME ỌTỤTỤ IHE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị kpaliri Sabina itinyekwu mgbalị n’ozi Jehova?

  • Olee otú akụkọ Sabina si agba gị ume?

  • N’afọ ije ozi 2018, olee ọnwa ndị ị chọrọ iji rụọ ọsụ ụzọ inyeaka?