(Ọpụpụ 32:26)

  1. 1. Anyị niile n’ekele Jehova.

    Ọ kpọpụtar’anyị n’okpukp’ụgha.

    O mere k’anyị mụt’eziokwu ya,

    Eziokwu ya n’enyen-dụ.

    (UKWE)

    N’akwado Jehova, K’ọ bụr’Enyi gị.

    Ọ gagh’ahapụ gị. N’edeb’iwu ya.

    Gaa gwa ’madụ niile na udo g’adị.

    Ọchịchị Kraịst Jizọs ga n’aga n’ihu.

  2. 2. Anyị niile n’akwado Chineke,

    N’ekwus’Al’eze ya n’ebe niile.

    Ony’ọ bụla g’ekpebi n’obi ya

    Ịkwado Chinek’anyị.

    (UKWE)

    N’akwado Jehova, K’ọ bụr’Enyi gị.

    Ọ gagh’ahapụ gị. N’edeb’iwu ya.

    Gaa gwa ’madụ niile na udo g’adị.

    Ọchịchị Kraịst Jizọs ga n’aga n’ihu.

  3. 3. Setan n’agbalị k’anyị tụọ y’ụjọ.

    M’anyị tụkwasịrị Chinek’obi.

    Ha dịọ-tụtụ, m’anyị dịo-le n’ole.

    Jehova g’echeb’anyị.

    (UKWE)

    N’akwado Jehova, K’ọ bụr’Enyi gị.

    Ọ gagh’ahapụ gị. N’edeb’iwu ya.

    Gaa gwa ’madụ niile na udo g’adị.

    Ọchịchị Kraịst Jizọs ga n’aga n’ihu.