(Ndị Filipaị 4:9)

  1. 1. Jehova Chineke,

    Biko, mee k’anyị nwe’udo.

    Anyị n’arịọ, nyea-nyị ’mụọn-sọ.

    K’anyị mịa mkpụrụ ya.

    Jizọs bụo-ny’eziokwu.

    Ọ bụ ya k’anyị n’eso.

    Anyị na gị dịzi nám-ma.

    Jehova, nar’ekele.

  2. 2. ’Mụọn-sọ n’eduzia-nyị.

    Okwu gị n’edukw’anyị.

    Ụwa gbara ọchịchịrị.

    M’Okwu gị n’ezia-nyịụ-zọ.

    Ruom-gbe udo n’ọṅụ

    Ga n’adị n’ebe niile,

    Nna, biko nyea-nyị ’mụọn-sọ

    K’udo gị dịnyer’anyị.

  3. 3. N’ụwa na n’el’igwe,

    Ndị gị dịkwa n’otu.

    I ji ’mụọn-sọ n’eduzia-nyị

    Ikwusa Al’eze gị.

    Anyị ma n’ị g’eme

    Kan-sogbu kwụsị n’ụwa.

    Ndị niile n’erub’isi

    G’enw’udo ru’ebigh’ebi.