Abụ nke 33
Unu Atụla Ha Egwu!
1. N’aga n’ihu, unu ndị nke m,
K’ozi ọma n’aga n’ihu.
Atụl’egwu nd’iro.
Ka ndị n’achọ eziokwu nụ
N’Ọkpara m, Kraịst Jizọs, bụ́ Eze,
Chụdar’ony’iro n’ụwa.
Ọ g’eke Ekwensu agbụ,
Tọpụ ndị o ker’agbụ.
(KORỌS)
Ezigb’ụmụ m, atụl’egwu
N’ihi iyi egwu ha.
M g’echebe ezi ndị ohu m
Dị ka mkpụrụ anya m.
2. Nd’iro unu dị ọtụtụ,
N’eyi egwu, n’ekwutọ unu.
Ha n’ej’ire ụtọ n’ọchị
N’achọ ịghọgbu unu.
Ndị agha m tụkwasịr’obi,
Atụkwala ha egwu,
Mụ onwe m g’echebe unu,
Mee ka unu nwee mmeri.
(KORỌS)
Ezigb’ụmụ m, atụl’egwu
N’ihi iyi egwu ha.
M g’echebe ezi ndị ohu m
Dị ka mkpụrụ anya m.
3. Echela n’echefuola m gị;
Abụ m ike na ọta gị.
A sị n’ị nwụọ n’ọgbọ agha,
Aga m akpọlite gị.
Atụl’egwu ndị n’egbu ahụ́,
H’apụgh’igbu mkpụr’obi.
Jid’okwukwe gị ru’ọgwụgwụ;
M g’enye gị ụgw’ọrụ!
(KORỌS)
Ezigb’ụmụ m, atụl’egwu
N’ihi iyi egwu ha.
M g’echebe ezi ndị ohu m
Dị ka mkpụrụ anya m.
(Gụọkwa Diut. 32:10; Nehe. 4:14; Ọma 59:1; 83:2, 3.)