Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 97

Ndị Ozi Alaeze, Gaanụ n’Ihu!

Ndị Ozi Alaeze, Gaanụ n’Ihu!

(2 Timoti 4:⁠5)

1. Gaanụ n’ihu n’ezi ndị ’madụ

Ozi ọma n’ebe niile.

Hụ ndị agbat’obi gị n’anya,

Mee ka ha fee Chineke.

Ozi Chineke bụ ih’ùgwù;

A’yị ji ọṅụ n’ekwus’okwu ya.

Gaanụ n’ubi, n’ezi ozi ọma;

Kwusaanụ aha Chineke.

(KORỌS)

Gaanụ, jir’ob’ike

kwusaa Al’eze n’ebe niile.

Gaanụ n’ihu, nọsi’ike

n’ijere Jehova ozi.

2. Ezi ndị ozi n’aga n’ihu,

Chineke g’akwụ h’ụgwọ.

Anyị ji obi dị ọhụrụ n’eso

Nz’ụkwụ Nn’anyị ukwu.

’Madụ niile kwesịrị ịnụ

Ozi Al’eze Chineke.

Anyị n’ekwusa ya n’ike Jaa;

Anyị agagh’atụ egwu!

(KORỌS)

Gaanụ, jir’ob’ike

kwusaa Al’eze n’ebe niile.

Gaanụ n’ihu, nọsi’ike

n’ijere Jehova ozi.

 3. Atụr’ọzọ n’ihe fọdụrụ

Ji otu obi n’aga n’ihu.

Ma ndị agadi ma ụmụaka

Nọsir’ike n’eziokwu.

Ozi anyị n’eje bụ ozi dị nsọ;

Ofufe anyị si anyị n’obi.

K’anyị jiri àgwà ọm’anyị

N’asọpụrụ Chinek’anyị.

(KORỌS)

Gaanụ, jir’ob’ike

kwusaa Al’eze n’ebe niile.

Gaanụ n’ihu, nọsi’ike

n’ijere Jehova ozi.