Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 69

Mee Ka M Mara Ụzọ Gị

Mee Ka M Mara Ụzọ Gị

(Abụ Ọma 25:⁠4)

1. Anyị ezukọọla, Jehova, Chineke,

Ịza òkù nke ị kpọr’anyị.

Okwu gị bụ ìhè dị n’okpor’ụzọ anyị.

Ọ bụ eb’i si ezi any’ihe.

(KORỌS)

Zi m ụzọ gị, meekwa ka m ghọta ya;

Ka m gee ntị n’iwu amamihe gị.

Mee ka m je’ije n’ụzọ eziokwu gị,

Meekwa ka iwu gị n’atọ m ụtọ.

2. Amamihe gị dị ok’elu, Chineke;

Ikpe gị n’enye ezi ob’ike.

Ruo ebigh’ebi, Okwu gị dị ebube;

Eziokwu gị n’adịgidekwa.

(KORỌS)

Zi m ụzọ gị, meekwa ka m ghọta ya;

Ka m gee ntị n’iwu amamihe gị.

Mee ka m je’ije n’ụzọ eziokwu gị,

Meekwa ka iwu gị n’atọ m ụtọ.