Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 43

Mụrụ Anya, Guzosie Ike, Dị Ike

Mụrụ Anya, Guzosie Ike, Dị Ike

(1 Ndị Kọrịnt 16:⁠13)

1. Mụr’anya, guzosie ike,

Kpebisi’ike ịtachi obi.

Jir’ob’ike n’aga n’ihu,

Anyị g’enwe mmeri.

A’yị n’erub’isi n’iwu Jizọs,

Anyị n’akwadosi ya ike.

(KORỌS)

Mụr’anya, ma guzosie ike!

Nọsi’ike ruo n’ọgwụgwụ!

2. Mụr’anya, nweekwa ezi uche,

Rub’isi ná nduzi Kraịst

N’eny’anyị taa site n’aka

Ohu ahụ nwer’uche.

Gee ntị na ndụmọdụ ndị okenye,

Ha n’echeb’atụrụ na eziokwu.

(KORỌS)

Mụr’anya, ma guzosie ike!

Nọsi’ike ruo n’ọgwụgwụ!

3. Mụr’anya, k’anyị dị n’otu,

Ma n’ekwusa ozi ọma.

Nd’iro n’emegide ya,

A’yị g’arụ ya ru’ọgwụgwụ.

So ndị ohu Jaa n’ụwa dum too ya.

Lee! Ụbọchị Jehova dị nso!

(KORỌS)

Mụr’anya, ma guzosie ike!

Nọsi’ike ruo n’ọgwụgwụ!