Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 22

“Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”

“Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”

(Abụ Ọma 23)

1. Jehova bụ Onye n’azụ m;

Gịnị g’eme ka m tụ’egwu?

Ọ n’azụ atụrụ ya nk’ọma,

Ọ gagh’echefu ndị ya.

Ọ n’edu m n’akụkụ ’miri,

Gọzie m, k’obi ruo m ala.

Ọ n’edukwa m n’ihi aha ya

N’ụzọ nke ezi omume.

Ọ n’edukwa m n’ihi aha ya

N’ụzọ nke ezi omume.

2. M jee ije n’ọchịchịrị,

M gaghị atụ egwu.

Onye N’azụ m nọ nso mgbe dum;

Mkpanaka ya n’edu m.

Ọ n’ete isi mụ ’manụ;

Ọ gbajur’iko m n’ọnụ.

Obiọma Chineke ga n’eso m,

M g’ebikwa n’ụlọ ya.

Obiọma Chineke ga n’eso m,

M g’ebikwa n’ụlọ ya.

 3. Onye n’azụ m hụrụ m n’anya!

M g’eji abụ too ya.

M g’akọrọ ndị yir’atụrụ

Akụkọ obiọma ya.

M g’eso Okwu ya mgbe dum,

N’eje ije n’ụzọ ya.

Ozi ya bụ akụ̀ bar’uru,

M g’eje ya kw’ụbọchị.

Ozi ya bụ akụ̀ bar’uru,

M g’eje ya kw’ụbọchị.

(Gụọkwa Ọma 28:9; 80:⁠1.)