Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 63

Guzosie Ike Mgbe Niile

Guzosie Ike Mgbe Niile

(Abụ Ọma 18:⁠25)

1. Guzosi’ike n’ebe Jaa nọ,

K’anyị gos’ịhụnanya.

Anyị nyere ya onw’anyị,

Chọọkwa ịma iwu ya.

Ozizi ya ga n’edu anyị,

A’yị g’erubere y’isi.

Jehova bụ ony’eziokwu.

Anyị agagh’ahapụ ya

2. Guzosi’ike n’oge mkpa

N’ebe ụmụnn’anyị nọ.

Hụ ha n’anya n’obi gị dum,

Gosikwa ha obiọma.

N’asọpụrụ ụmụnn’anyị,

Kwanyere ha dum ùgwù.

Ka Okwu Jaa dọt’anyị nso;

Anyị agagh’ahapụ ha.

3. Guzosi’ike ná nduzi

Ndị okenye n’eny’anyị.

Ha gwa anyị ihe a g’eme,

K’anyị rubere h’isi.

Jehova g’agọzi anyị,

Meekwa k’anyị dị ike.

Anyị niile guzosi’ike,

A’yị g’abụ nke Jehova.