Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 17

Gaanụ n’Ihu, Ndịàmà!

Gaanụ n’Ihu, Ndịàmà!

(Luk 16:⁠16)

1. Ndị ohu Chineke kpebisir’ike

Ikwusa ozi Al’eze n’oge ọgwụgwụ a.

N’ezie, Setan n’emegide anyị,

N’ike Jaa, anyị anaghị atụ egwu.

(KORỌS)

Gaanụ n’ihu, Ndịàmà, k’obi si’unu ike!

Ṅụrịanụ ọṅụ n’unu n’arụ ọrụ Chineke!

Kwusaanụ n’ụwa dum na Paradaịs dị nso,

N’ọ gagh’adị anya ngọzi y’abịa.

2. Ndị agha Jaa anagh’ezu ike ugbu a;

Anyị anaghị azụr’ụtọ ndị ọchịchị.

Anyị achọgh’inwe ntụp’ọ bụla,

Anyị g’ejisi okwukw’anyị ike.

(KORỌS)

Gaanụ n’ihu, Ndịàmà, k’obi si’unu ike!

Ṅụrịanụ ọṅụ n’unu n’arụ ọrụ Chineke!

Kwusaanụ n’ụwa dum na Paradaịs dị nso,

N’ọ gagh’adị anya ngọzi y’abịa.

3. Ọtụtụ ajụla Al’eze Chineke;

Ha n’ekwutọ aha ya k’ọ ghar’ịdị nsọ.

K’anyị soro mee k’e doo ya nsọ,

Kwusaara ya ebo na mba niile.

(KORỌS)

Gaanụ n’ihu, Ndịàmà, k’obi si’unu ike!

Ṅụrịanụ ọṅụ n’unu n’arụ ọrụ Chineke!

Kwusaanụ n’ụwa dum na Paradaịs dị nso,

N’ọ gagh’adị anya ngọzi y’abịa.