Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 114

Akwụkwọ Chineke Bụ Akụ̀

Akwụkwọ Chineke Bụ Akụ̀

(Ilu 2:​1, 4)

1. E nwere otu akwụkwọ bur’ibu,

Ọ n’eny’udo, ọṅụ, n’olil’anya.

Ọ n’ez’ihe dị ebube, n’akpa ike;

N’eme ka “ndị nwụr’anwụ” dị ndụ.

Ọ bụ Baịbụl Nsọ nke Chineke.

O nyere ndị dere y’ike ’mụọ nsọ.

Ha hụrụ Jehova Chineke n’anya,

’Mụọ nsọ ya duziri ha, nye h’ike.

2. Ha der’otú Chineke si kee ihe,

Jir’ike ya kee el’igwe n’ala.

Ha kọrọ na ’madụ zur’okè na mbụ,

Kọọkwa otú Paradaịs ha si fuo.

Ha kọkwara banyere otu ’mụ’ozi

Mara Chineke n’ọchịchị y’aka,

Kpatara ’madụ mmehie n’ahụhụ,

Ma mmeri nke Jehova dị nso.

 3. Anyị bi ugbu a n’oge oké ọṅụ.

Jizọs n’achị n’Al’eze Chineke.

Ugbu a bụ oge Jehova n’azọpụta

Ndị ji obi ha dum bịakwute ya.

Ọ bụ akwụkwọ ya kọr’ihe ọma ndị a;

Ọ bụ nri dị nsọ nke anyị g’eri.

Ọ n’eny’udo karịrị uche ’madụ;

Akụ̀ a chọrọ k’anyị niile gụọ ya.