Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 110

Ọrụ Dị Ebube nke Chineke

Ọrụ Dị Ebube nke Chineke

(Abụ Ọma 139)

1. O, Jaa, ị ma ụra m na nteta m,

Ndin’ala m nakwa mbilite m.

Ị n’enyocha ma echiche m ma obi m,

Ị makwa okwu ọnụ m na

ije ụkwụ m.

Ị hụrụ mgbe m nọ n’afọ nne m,

Ọkpụkpụ m ezogh’ezo n’ihu gị.

Ị hụr’ahụ́ m; i dere ya n’akwụkwọ.

M n’eto ọrụ ebube gị

na ike gị.

Amamihe gị dị ukwuu, dịkwa egwu,

Mkpụr’obi m maara nke a nk’ọma.

M tụọ egwu n’ọchịchịrị g’ekpuchi m,

M g’enweta ’mụọ nsọ gị n’eb’ahụ.

Jehova, ọ̀ dị ebe m g’ezo

M’ọ bụ kpuchie onwe m k’ị ghar’ịhụ m?

Ọ bụghị n’elu m’ọ bụ n’ime ili

M’ọ bụ n’ọchịchịrị m’ọ bụ n’osimiri.