Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Zekaraya 8:1-23

8  Okwu Jehova nke ụsụụ ndị agha wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha+ kwuru, ‘M ga-ekwosiri Zayọn ekworo ike,+ m ga-ejikwa oké ọnụma+ kwooro ya ekworo.’”  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘M ga-alaghachi na Zayọn+ wee biri n’ime Jeruselem;+ a ga-akpọkwa Jeruselem obodo eziokwu,+ kpọọkwa ugwu Jehova+ nke ụsụụ ndị agha ugwu nsọ.’”+  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Ndị agadi nwoke na ndị agadi nwaanyị ga-anọdụ ala n’ámá ndị dị na Jeruselem,+ onye ọ bụla ga-eji mkpara+ ya n’aka n’ihi ịdị ogologo ndụ.  Ámá ndị dị n’obodo ga-ejupụta n’ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ ndị na-egwuri egwu n’ámá ya.’”+  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Ọ bụ ezie na ọ ga-abụ ihe sibigara ike ókè n’anya ndị fọdụrụ n’ime ndị a n’ụbọchị ahụ, ò kwesịrị ịbụ ihe sibigara ike ókè n’anya m?’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Lee, m na-azọpụta ndị m n’ala nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ala nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ.+  M ga-akpọbata ha, ha ga-ebikwa n’ime Jeruselem;+ ha ga-aghọ ndị m,+ mụ onwe m ga-aghọkwa Chineke ha n’eziokwu na n’ezi omume.’”+  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Unu ndị na-anụ n’ụbọchị ndị a ihe ndị amụma na-ekwu,+ meenụ ka aka unu dị ike+ n’ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọ Jehova nke ụsụụ ndị agha, iji wuo ụlọ nsọ ahụ.+ 10  N’ihi na tupu ụbọchị ndị ahụ, ụmụ mmadụ adịghị enweta ụgwọ ọrụ ha;+ ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ anụ ụlọ na-enweta, udo adịghịrị onye na-apụ apụ nakwa onye na-abata abata n’ihi onye iro,+ n’ihi na emere m ka mmadụ niile na-emegide ibe ha.’+ 11  “‘Ugbu a, agaghị m adịrị ndị fọdụrụ ná ndị a otú m dịịrị ha na mbụ,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 12  ‘N’ihi na a ga-enwe mkpụrụ udo;+ osisi vaịn ga-amị mkpụrụ,+ ala ga-emepụta ihe,+ eluigwe ga-emekwa ka igirigi daa;+ m ga-emekwa ka ndị fọdụrụ+ ná ndị a nweta ihe a niile.+ 13  Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka unu bụ́ ụlọ Juda nakwa ụlọ Izrel+ ghọrọ ihe nkọcha n’etiti mba dị iche iche,+ otú ahụ ka m ga-azọpụta unu, unu ga-aghọkwa ngọzi.+ Unu atụla egwu.+ Meenụ ka aka unu dị ike.’+ 14  “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘“Dị nnọọ ka ọ dị m n’obi ime ka ọdachi dakwasị unu n’ihi iwe ndị nna nna unu kpasuru m,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “agbanweghịkwa m obi m,+ 15  otú ahụ ka ọ ga-adịghachi m n’obi n’ụbọchị ndị a imeso Jeruselem na ụlọ Juda ihe n’ụzọ dị mma.+ Unu atụla egwu.”’+ 16  “‘Ihe ndị a ka unu ga na-eme:+ Na-agwanụ ibe unu eziokwu.+ Na-ekpenụ ikpe n’eziokwu, na-ekpekwanụ ikpe udo n’ọnụ ụzọ ámá unu.+ 17  Unu akpala nkata n’ime obi unu ịkpatara ibe unu ọdachi,+ unu ahụkwala iyi ụgha n’anya;+ n’ihi na m kpọrọ ihe ndị a niile asị,’+ ka Jehova kwuru.” 18  Okwu Jehova nke ụsụụ ndị agha wee ruo m ntị ọzọ, sị: 19  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Ọnụ unu na-ebu n’ọnwa nke anọ,+ na ọnụ unu na-ebu n’ọnwa nke ise,+ na ọnụ unu na-ebu n’ọnwa nke asaa,+ na ọnụ unu na-ebu n’ọnwa nke iri,+ ga-aghọrọ ụlọ Juda ihe obi ụtọ na ihe ọṅụ, bụrụkwa oge ememme dị mma.+ Ya mere, hụnụ eziokwu na udo n’anya.’+ 20  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Ndị mmadụ na ndị bi n’ọtụtụ obodo ga-abịa;+ 21  ndị bi n’otu obodo ga-agakwuru ndị bi n’obodo ọzọ, sị: “Ka anyị jiri obi anyị dum gaa+ mee ka obi Jehova jụrụ+ ma chọọ ihu Jehova nke ụsụụ ndị agha. Mụ onwe m ga-agakwa.”+ 22  Ọtụtụ ndị nakwa mba ndị dị ike ga-abịa chọọ Jehova nke ụsụụ ndị agha n’ime Jeruselem,+ meekwa ka obi Jehova jụrụ.’ 23  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Ọ ga-eru n’ụbọchị ahụ na ndị ikom iri ndị si n’asụsụ niile nke mba dị iche iche+ ga-ejide,+ ee, ha ga-ejide uwe mwụda nke nwoke bụ́ onye Juu,+ sị, “Anyị ga-eso unu,+ n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji