Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Zekaraya 13:1-9

13  “N’ụbọchị ahụ,+ a ga-egwuru ụlọ Devid na ndị bi na Jeruselem olulu mmiri+ iji sachapụ ha mmehie+ na ihe na-asọ oyi.+  “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “na m ga-ebipụ aha arụsị niile n’ala ha,+ a gaghịkwa echeta ha ọzọ; m ga-emekwa ka ndị amụma+ na ike ndị mmụọ ọjọọ si n’ala a pụọ.+  Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na mmadụ ebuo amụma ọzọ, nna ya na nne ya, bụ́ ndị mụrụ ya, ga-asị ya, ‘Ị gaghị adị ndụ, n’ihi na i kwuwo okwu ụgha n’aha Jehova.’ Nna ya na nne ya, bụ́ ndị mụrụ ya, ga-ama ya ube n’ihi amụma o buru.+  “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ihere ga-eme ndị amụma,+ ihere ga-eme onye nke ọ bụla n’ihi ọhụụ ọ hụrụ mgbe ọ na-ebu amụma; ha agaghịkwa eyi uwe ndị amụma e ji ajị anụ mee+ iji na-aghọgbu ndị mmadụ.  Onye nke ọ bụla n’ime ha ga-asị, ‘Abụghị m onye amụma. Abụ m onye na-akọ ubi, n’ihi na mmadụ goro m ọrụ kemgbe m bụ nwa okorobịa.’  Mmadụ ga-ajụkwa ya, sị, ‘Gịnị bụkwanụ ọnyá a niile dị gị n’ahụ́?’ Ọ ga-azakwa ya, sị, ‘Ọ bụ ahụ́ e merụrụ m n’ụlọ ndị hụrụ m n’anya nke ukwuu.’”  “Mma agha, teta bịakwasị onye ọzụzụ atụrụ m,+ bịakwasị ọbụna nwoke gbasiri ike nke bụ́ enyi m,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. “Gbuo onye ọzụzụ atụrụ,+ ka ìgwè atụrụ ya wee gbasasịa;+ m ga-eme ka aka m dịnyere ndị na-abaghị n’ihe.”+  Nke a bụ ihe Jehova kwuru, “Ọ ga-erukwa na a ga-ebipụ ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị bi n’ala a dum, ha ga-ekubikwa ume;+ ma a ga-ahapụ otu ụzọ n’ụzọ atọ ka ha fọdụ n’ime ya.+  M ga-etinye otu ụzọ n’ụzọ atọ ahụ n’ọkụ;+ m ga-anụcha ha dị ka e si anụcha ọlaọcha,+ nwaleekwa ha dị ka e si anwale ọlaedo.+ Ma, ha ga-akpọku aha m, m ga-azakwa ha.+ M ga-asị, ‘Ha bụ ndị m,’+ ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Jehova bụ Chineke anyị.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji